Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a : Ndị mmadụ rahụrụ n'ezi taa amaka Markle

Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:

Taa bụ ụbọchị a karaaka n'isi Prince Harry na Meghan Markle

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Meghan Markle gbara afọ 36 ebe dị ya gbara afọ 33

Nwa nwa Queen Elizabeth bụ Prince Harry na Meghan Markle chọrọ Igba akwụkwọ n'ụlọụka St. George na Windsor tata.

Fashola sị n'inyi juru na be anyị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Babatunde Fashola bụ minista na ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ

Minista na-ahụ maka ọrụ, ọkụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka etu ha si na-awụfụ ahịhịa n'ọkporoụzọ.

Fashola Kwuru nke a ka ọ gara nyochaa ọrụ gọọmentị na-arụ n'Abia steetị, bụ ebe o kwuru na nwufu ahịhịa n'okporoụzọ bụ ihe juru ya anya site Okigwe ruo Lokpanta.

Ugboelu kuriri na Cuba

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri

Ndị nyocha naha etinye anya n'ihe kpatara ụgbọelu jiri kurie ụnyaahụ n'akụkụ isi obodo Cuba bụ Havana.

Isi mmadụ dị otu narị na isii (106) lara ebe mmadụ atụ pụtara na ya bụ ihe mberede.

Miyatti Allah dọrọ Gọvanọ Ortom aka na nt

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nnyocha ka na-aga n'ihu maka ụgbọelu a kuriri

Ndị na-anọchite anya ndị Fulani na-achị ehi na Naịjirịa bụ Miyetti Allah, akpọọla onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka ọ dọọ aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom aka na ntị.

Ortom hibere iwu imachi ndị ọchịehi ịchịgharị ehi ha na gburugburu steeti ahụ. Ndị Miyetti kwuru na ha ga-eme ihe niile n'usoro iwu ịhụ na egbochighi ha ibi ndụ etu ha si ebi.

Gee nkeji nke abalị a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAra m bụ oke ibu arụ nye m

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a